1 Chronicles 21

Devid agụọ ndị agha ya ọnụ

1Ekwensu biliri megide Izrel, mgbe ọ kpaliri Devid ka ọ gụọ Izrel ọnụ. 2Ya mere, Devid gwara Joab na ndịisi agha okwu sị, “Gaa gụọ ụmụ Izrel niile ọnụ, site na Bịasheba ruo Dan. Emesịa, bịa gwa m ihe ị gụtara ka m mata ole ọnụọgụgụ ha dị.”

3Ma Joab zaghachiri, “Ka Onyenwe anyị mee ka ndị agha ya mụbaa, otu onye narị ụzọ karịa. Ma onyenwe m eze, ọ bụ na ndị a niile abụghị ndị nọ nʼokpuru ọchịchị onyenwe m? Nʼihi gịnị ka onyenwe m ji na-achọ ime ihe a? Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji wetara Izrel ikpe ọmụma?”

4Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab. Ya mere, Joab pụrụ gagharịa nʼIzrel niile, mechaa lọghachikwa na Jerusalem. 5Joab nyere Devid ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel niile. NʼIzrel niile, ha dị otu nde, na narị puku ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, tinyekwara narị puku ndị ikom anọ na iri asaa nʼala Juda ndị na-amịpụta mma agha.

6Ma Joab agụnyeghị ndị Livayị, na ndị Benjamin nʼọnụọgụgụ ahụ, nʼihi na iwu eze amasịghị ya nʼobi nʼụzọ ọbụla. 7Iwu banyere ọnụọgụgụ a adịghịkwa Chineke mma nʼanya. Ya mere, ọ tara ndị Izrel ahụhụ nʼihi ya.

8Mgbe ahụ, Devid sịrị Chineke, “Emehiela m nke ukwuu site nʼihe a m mere. Ma ugbu a, biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.”

9 Onyenwe anyị gwara Gad, onye ọhụ ụzọ Devid, sị, 10“Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ”

11Ya mere Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, Họrọ nke dị gị mma. 12Oke ụnwụ nke ga-adị afọ atọ, ka ọ bụ ọnwa atọ nke mkpochapụ nʼihu ndị iro unu, site na mma agha ha ga-eru unu ahụ, ka ọ bụ ụbọchị atọ nke mma agha Onyenwe anyị, bụ ajọ ọrịa na-efe efe ịda nʼala a, nke mmụọ ozi Onyenwe anyị ga-eme ka ọ bịakwasị ala Izrel niile. Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.”

13Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ọ ka mma ka m daba nʼaka Onyenwe anyị karịa ịdaba nʼaka mmadụ. Nʼihi na obi ebere ya bara ụba nke ukwuu.”

14Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, iri puku ndị ikom asaa dara nwụọ. 15Chineke zipụrụ mmụọ ozi ị ga bibie Jerusalem, ma dịka mmụọ ozi ahụ na-eme nke a, Onyenwe anyị hụrụ ya, o wutere ya nʼihi mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-ebibi ndị mmadụ, “O zuola! Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị na-eguzo nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus.

16Mgbe Devid leliri anya elu hụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzo nʼetiti mbara eluigwe na ụwa, hụkwa mma agha o ji, nke o chere ihu ya na Jerusalem, ya na ndị okenye Izrel yi akwa mkpe, dara nʼala kpuo ihu nʼala.

17Devid sịrị Chineke, “Ọ bụghị m nyere iwu ka a gụọ ndị tozuru ibu agha ọnụ? Ọ bụ mụ onwe m, mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mehiere mee ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Onyenwe anyị Chineke m, biko ekwela ka ọrịa a na-efe efe nọgide nʼahụ ndị gị, ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.”

Devid e wuo ebe ịchụ aja

18Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere Gad iwu ka ọ gwa Devid, ka ọ gaa wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus. 19Ya mere, Devid rubere isi gaa dịka okwu ahụ Gad kwuru nʼaha Onyenwe anyị.

20Mgbe Arauna nọ nʼebe ịzọcha ọka, ọ tụgharịrị hụ mmụọ ozi ahụ, ụmụ ya ndị ikom anọ ndị so ya guzo nʼebe ahụ zoro onwe ha. 21Mgbe Devid bịakwutere Arauna, Arauna weliri anya hụ ya, ọ hapụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ, bịa kpọọ isiala nye Devid, kpudokwa ihu ya nʼala.

22Devid sịrị ya, “Nye m ebe a, bụ ala ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja, ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ. Resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru.”

23Ma Arauna zara sị Devid, “Were ya ka onyenwe m eze mee ihe ọbụla dị ya nʼobi. Aga m enye ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, ihe nzọcha ọka niile ka ha bụrụ nkụ na ọka wiiti maka ịchụ aja mkpụrụ ọka. Aga m enye ha niile.”

24Ma eze Devid zaghachiri Arauna, “ee, aghaghị m ịkwụzu gị ọnụahịa ya. Nʼihi na agaghị m ewere ihe bụ nke gị nye ya Onyenwe anyị, maọbụ chụọ aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.”

25Ya mere, Devid kwụrụ Arauna narị shekel ọlaedo isii iji zụrụ ebe ahụ. 26Devid wuru ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ, chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zakwara ya, site nʼọkụ nke si nʼeluigwe daa nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ.

27Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere mmụọ ozi ahụ iwu ka o tinyekwa mma agha ya nʼọbọ ya. 28Mgbe Devid hụrụ na Onyenwe anyị azala ekpere ya nʼebe ịzọcha ọka nke Arauna onye Jebus, ọ chụkwara aja ọzọ nye Onyenwe anyị. 29Ụlọ ikwu Onyenwe anyị na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ Mosis wuru nʼọzara dị nʼebe dị elu Gibiọn, nʼoge ahụ. 30Ma Devid ejerughị ebe ahụ ịjụta Chineke ase, nʼihi na ụjọ tụrụ ya mgbe ọ hụrụ mma agha ahụ dị nʼaka mmụọ ozi Onyenwe anyị.

Copyright information for IboBIU